1 Chronicles 10

Ọnwụ Sọl

1Nʼoge a ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa. 2Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua. 3Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ.

4Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.”

Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.
5Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, nwụọkwa. 6Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ nwụrụ, ndị niile si nʼụlọ ya nwụkwara nʼotu mgbe ahụ.

7Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.

8Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa. 9Ha yipụrụ ya ihe niile oyi, buru isi ya na ihe agha ya, zipụkwa ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nye ndị ha niile na arụsị ha niile. 10Ha tinyere ihe agha ya nʼụlọ chi ha, kwụbakwa okpokoro isi ya nʼụlọ Dagọn.

11Mgbe ndị Jebesh Gilead niile nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl, 12ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, biliri gaa buru ozu Sọl na ụmụ ya, bulata ha na Jebesh. Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi ukwu dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.

13Sọl nwụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị, o debeghị okwu Onyenwe anyị, karịsịa, ọ gara na nke onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, nʼihi ịjụta ya ase, 14ma ọ jụghị ase site nʼọnụ Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere Onyenwe anyị ji gbuo ya, were alaeze ya nyefee Devid nwa Jesi nʼaka.

Copyright information for IboBIU